2 Corinthians 1

1Pọl, onyeozi nke Jisọs Kraịst dịka ọchịchọ nke Chineke si dị, na Timoti nwanne anyị nwoke,

Na-edegara chọọchị Chineke nke dị na Kọrint, na ndị nsọ niile ndị nọ nʼala Akaịa akwụkwọ:

2Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.

Ekele dịrị Chineke onye nkasiobi

3Otuto dịrị Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ Nna nke obi ebere, nakwa Chineke nke nkasiobi niile. 4Onye na-akasị anyị obi nʼime nsogbu anyị niile, ka anyị site nʼụzọ dị otu a nwee ike ịkasị ndị ọzọ niile nọ na nsogbu dị iche iche obi. Inyere ha aka dịka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nʼaka Chineke. 5Nʼihi na dịka anyị si eketa oke nʼime ọtụtụ ahụhụ nke Kraịst, otu a nkasiobi anyị na-ababiga ụba site na Kraịst. 6Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nʼihi na nkasiobi unu, nakwa nzọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, ọ bụkwa nʼihi nkasiobi unu, nke na-arụpụta ike na ume iji ntachiobi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa. 7Olileanya anyị nwere nʼebe unu nọ sịrị ike, ebe anyị maara na dịka unu si eketa oke nʼịta ahụhụ anyị, otu ahụkwa ka unu ga-esi keta oke na nkasiobi ahụ anyị na-anata.

8Anyị chọrọ ka unu mara ụmụnna m, ihe banyere nsogbu e sogburu anyị nʼEshịa. Nʼezie, nsogbu ahụ karịrị anyị ike, mee ka anyị hapụ inwekwa olileanya na anyị ga-emesi dịrị ndụ. 9Nʼezie, ọ dị nnọọ nʼoge ahụ, dịka a ga-asị na a mara anyị ikpe ọnwụ. Ma anyị maara na o si otu a mee ka anyị nwee ike ịmụta na o kwesighị ka anyị tụkwasị obi nʼike nke aka anyị, kama ka anyị nwee olileanya nʼime Chineke, onye pụrụ ime ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie. 10Ọ bụ Chineke bụ onye zọpụtara anyị site nʼime oke ọnwụ dị otu a. Anyị nwekwara ntụkwasị obi na ọ ga-aga nʼihu na-azọpụtakwa anyị, 11dịka unu ga-enyekwara anyị aka site nʼekpere unu, ka ọtụtụ nwere ike nye ekele nʼihi anyị maka onyinye amara anyị natara na nzaghachi ekpere ọtụtụ mmadụ ndị a na-ekpere anyị.

Mgbanwe nzube Pọl

12Ịnya isi anyị bụ nke a, na akọnuche anyị na-agbara anyị akaebe na anyị kpara agwa ọma nʼụwa, karịchasịa nʼebe unu nọ, nʼịdị nsọ na izi ezi nke si nʼaka Chineke. Nke a bụ site nʼamara o nyere anyị, ọ bụghị site nʼamamihe nke mmadụ. 13Nʼihi na ihe anyị na-edere unu abụghị ihe unu na agaghị agụta maọbụ ghọta. Enwere m nchekwube na unu ga-aghọta ya nke ọma. 14Dịka unu ghọtarala anyị nwa nke nta ugbu a, unu ga-eji anyị anya isi nʼụbọchị nke Onyenwe anyị Jisọs.

15Ihe m na-ekwu were m anya, nke mere m ji chọọ ibu ụzọ bịa leta unu ka unu nwee uru abụọ. 16Ebu m ya nʼobi na m ga-akwụsị hụ unu mgbe m na-agafe ịga Masidonia. Ebukwa m ya nʼobi m na mgbe m si Masidonia na-alaghachi na m ga-akwụsịkwa ileta unu, ka unu nweekwa ike inyere anyị aka mgbe anyị bidoro ịlaghachi Judịa. 17E nwere m obi abụọ mgbe m chọrọ ime nke a? Ana m ezube nzube m dịka mmadụ nkịtị, onye dị nkwadobe ikwu “E,” na “E e,” nʼotu oge ahụ?

18Ma dịka Chineke si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi, okwu anyị gwara unu abụghị “E,” na “E e.” 19Nʼihi na Ọkpara Chineke, Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼọnụ Saịlas na Timoti na mụ onwe m kwusaa abụghị “E” na “E e,” kama nʼime ya ọ bụ naanị “E.” 20Nʼime Kraịst ka anyị hụrụ “E” na nkwa niile nke Chineke kwere ụmụ mmadụ. Nke a mere anyị ji site na ya kwee “Amen” nʼinye Chineke otuto. 21Ọ bụ Chineke nʼonwe ya mere ka anyị na unu guzosie ike nʼime Kraịst. O meela ka anyị bụrụ ndị e tere mmanụ. 22Ọ kara anyị akara nʼihu, nyekwa anyị Mmụọ Nsọ ya ka o biri nʼobi anyị, dịka onye ga-ahụ na anyị ga-emezu nkwa ahụ niile.

23Ana m akpọku Chineke dịka onye akaebe m, ọ bụ nʼihi ịnapụta unu mere m ji hapụ ịbịa Kọrint. 24Ọ bụghị na anyị bụ ndị ọchịchị nke okwukwe unu, kama anyị so unu na-arụkọ ọrụ ka unu nwe ọṅụ nʼihi na ọ bụ site nʼokwukwe ka unu ga-esi kwụrụ chịm.

Copyright information for IboBIU